Nahum 3

Ahụhụ dịrị Ninive

1Ahụhụ dịrị obodo ọbara,
nke jupụtara nʼụgha,
na ihe e zutere nʼohi.
Ọ dịghị mgbe ị na-adịghị adọgbu.
2Ụda ụtarị,
ụda ụkwụ ụgbọ ịnyịnya,
ikiri ụkwụ ịnyịnya na-agba ọsọ,
na mkpọtụ nke ụgbọ ịnyịnya agha!
3Ndị agha ịnyịnya,
na-agbagharị na-efegharị mma agha na-egbu amụma,
na ùbe ha na-egbuke egbuke.
Ndị e gburu egbu dị ọtụtụ,
ntụkọta ozu tọgbọrọ ebe niile,
ozu a na-enweghị ike ịgụta ọnụ,
ndị mmadụ na-asọ ngọngọ mgbe ha na-azọkwasị ozu ụkwụ na-agafe.
4Ihe ndị a mere nʼihi enweghị afọ ojuju nke agụụ nke onye na-akwa iko,
onye ji mma ile anya, nwanyị nwe mgbaasị dị iche iche,
onye ji mba dị iche iche nʼagbụ site nʼịgba akwụna ya,
na ọtụtụ mmadụ dị iche iche site na mgbaasị ya.

5“Edoola m onwe m imegide gị,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
“Aga m ekpughepụ uwe gị, jiri ya kpuchie gị ihu,
si otu a gosi mba niile nke ụwa ọtọ gị.
Ihere ga-emekwa gị nʼihu alaeze niile.
6Aga m awụkwasị gị ihe arụ dị iche iche,
meso gị mmeso onye e ledara anya,
mekwaa ka ị bụrụ ihe ilere anya nye mmadụ niile.
7Ndị niile hụrụ gị ga-agbara gị ọsọ na-asị,
‘Ninive aghọọla ihe lara nʼiyi, onye ga-eru ụjụ nʼihi ya?’
Ebee ka m ga-achọta onye ga-akasị gị obi?”

8Ị dị mma karịa Tibs,
bụ obodo dị nʼọnụ mmiri Naịl,
nke mmiri gbara gburugburu?
Osimiri ahụ bụ ihe o ji echebe onwe ya,
mmiri ahụ bụkwa mgbidi gbara ya gburugburu.
9Kush
Ya bụ, Itiopia
na Ijipt bụ agbamume ya nke na-enweghị ọgwụgwụ,
Put na Libịa sokwa bụrụ ndị enyemaka ya.
10Ma otu ọ dị, ebugara ya nʼala ndị ọzọ
dịka ohu a dọtara nʼagha.
A tụpịasịrị ụmụ ya a mụrụ ọhụrụ nʼelu nkume,
nke dị nʼisi okporoụzọ ya niile.
E fekwara nza iji kesaa ndị ya niile a na-asọpụrụ,
e kekwara ndị ukwu ya niile mkpọrọ igwe.
11Gị onwe gị ga-aṅụbigakwa mmanya oke,
Ga-adagbugharị dịka onye mmanya na-egbu

ị ga-abụ onye zoro onwe ya ezo,
ma chọkwa ebe mgbaba nʼihi ịgbanarị ndị iro gị.

12Ebe gị niile e wusiri ike dịka osisi fiig
nke mkpụrụ mbụ ya chara nʼelu ya.
Ma mgbe a kwagharịrị ya
mkpụrụ ndị ahụ na-adaba nʼọnụ onye na-eri ya.
13Lee ndị agha gị,
ha niile bụ ụmụ nwanyị nʼetiti gị.
E megheela ọnụ ụzọ ama nke ala gị niile
nye ndị iro gị.
Ọkụ erepịakwala na mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ unu niile.

14Seta mmiri maka oge nnọchibido,
mee ka ebe gị niile nke ewusiri ike siekwa ike karịa.
Gwupụta ụrọ,
zọta aja, jiri ụrọ ndị ahụ
kpụtakwa aja,
Lit. Blọk brik
rụzikwaa ụlọ ahụ.
15Nʼebe ahụ ka ọkụ ga-erechapụ gị,
mma agha ga-egbutu gị.
Ọ ga-eripịa gị dịka igurube si erichapụ ihe niile dị ya nʼihu.
Ọ bụladị ma i mee onwe gị ka i hie nne dịka ụkpana,
maọbụ mụbaa dịka igurube.
16Ị meela ka ndị ahịa gị mụbaa nʼọnụọgụgụ,
baa ụba karịa kpakpando dị nʼeluigwe,
dịka igurube ha na-eripịa ala ahụ,
gbasaa nku ha efelaga
17Ndị nche gị bara ụba igurube,
ndị ode akwụkwọ gị dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka igwe igurube
na-ebekwasị nʼelu mgbidi nʼụbọchị oyi.
Ma mgbe anyanwụ wara, ha na-efelaga;
ọ dịkwaghị onye maara ebe ha feere gaa.

18Eze ndị Asịrịa, ndị ọzụzụ atụrụ
Maọbụ, ndị ndu
gị na-ero ụra,
ndị unu a na-asọpụrụ adaala nʼụra ọnwụ.
Ndị gị niile agbasasịala nʼelu ugwu niile,
ọ dịkwaghị onye ha nwere nke ga-achịkọta ha.
19Ọ dịghị ihe nwere ike ime ka i si nʼọnọdụ ị nọ ugbu a biliekwa.
Nʼihi na ọnya dị gị nʼahụ ga-egbu gị.
Ndị niile nụrụ ihe dakwasịrị gị
ga-eji ọṅụ kụọ aka ha,
nʼihi na onye ka mmadụ ahụ bụ
nke na-anụrụghị ụfụ nke enweghị obi ebere gị?
Copyright information for IboBIU